Jidekaiji Media

Categories

My courses

Explore

Menu

How well can you speak and write Igbo Language? Oja column with Amarachi Attamah

NLE FU ANYA.
Odee…
Amarachi Attamah
Ndị Igbo sị na okwu a na-asọ anya, anaghị ebi gboo. Ihe a na-afụ m n’obi m choro ikwu maka ya taa bụ NLEFU ANYA. Nlefu anya emebiela ọtụtụ ihe n’obodo anyị ma ezinụlọ anyị taa. Ọnwụ mberede dị iche iche, ọya dị iche iche na-akpagharịzi, agaghị n’ihu, ohi n’ụdị dị iche iche, mmegbu, ebighị n’udo, enweghị obi aṅụrị, agụụ, na agwa ọjọọ dị iche iche na-akpagharịzi. Ihe ndia niile na-eme mana o nweghizi onye ọ gbasara.
Ndịisi n’obodo na-elefuzi anya. Ndịisi n’ogo dị iche iche na-agbazi ndị ha na achị alụkwaghịm. Ụfọdụ ndị nne na nna lefuziri ụmụ ha anya, ụmụaka a na-akpagharịzi ka ụmụ atụrụ na-enweghi onye nche. Nlefu anya ọ kazi mma?
Anyị a ga-ejizi maka agụụ loo ụkwara. Ọ kwanụ a gbaa nsị nkịtị, ọ na-esi isi. Mana ọnwụ na-egbu nwa nkịta anaghị ekwe ya nụrụ isi nsị. Enenia nwa ite, o gbonyụọ ọkụ. Ụdara na-asịbu na sọọsọ ya mụtara nwa a na-apiwa ọnụ; mana kịtaa, a na-apịwazikwa ụmụ ndị ọzọ ọnụ.
Nwoke bubatara ọgwụ na-adịghị mma n’ahụ amaghị na nwunye ya ga-azụtara nwa ya ọgwụ ahụ mgbe ahụọkụ mberede biakwutere ya. READ THE FULL STORY IN JIDEKAIJI MAGAZINE OJA With Amarachi Attamah
Igbo amaka, igbo ga di, How many of us can write igbo fluently?
Amarachi Attamah continue to Wow us in her intriguing Oja written strictly in Igbo Language. Watch out for another great igbo Master piece from her in our Next Issue JIDEKAIJIMAGAZINE
An Igbo Language advocate|Creative Entrepreneur|Performing Poet|Broadcaster| Author|Igbo poetry coach

Leave a Comment

Your email address will not be published. Required fields are marked *